Job 9

Ọ bụrụ ihe e ji ike eme, lee na ọ dị ike nke ukwuu! Ọzọ ọ bụrụ nʼikpe ziri ezi, onye pụrụ iguzogide ya.

Job 9:19 (UKJV) If I speak of strength, lo, he is strong: and if of judgment, who shall set me a time to plead?

17Ọ ga-eji oke ifufe tirie m, meekwa ka ihe mgbu m baa ụba na-enweghị ihe butere ya.

18Ọ gaghị ekwe ka iku ume m lọghachi kama ọ ga-eji iru ụjụ kpuchie m.

19Ọ bụrụ ihe e ji ike eme, lee na ọ dị ike nke ukwuu! Ọzọ ọ bụrụ nʼikpe ziri ezi, onye pụrụ iguzogide ya.

20A sịkwarị na aka m dị ọcha, ọnụ m ga-ama m ikpe; ọ bụrụ na abụ m onye na-enweghị ịta ụta, ọ ga-agụ m nʼonye ikpe mara.

21“Ọ bụ ezie na abụ m onye ikpe na-amaghị ejighị m onwe m kpọrọ ihe; nʼezie ana m eleda ndụ m anya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.