1Job zara sị:
2“Nʼezie, amaara m na ihe ndị a bụ eziokwu. Ma mmadụ dị ndụ ọ ga-esi aṅaa gosi na ya bụ onye aka ya dị ọcha nʼihu Chineke?
3Ọ bụrụ na Chineke ekpebie ịjụ mmadụ ajụjụ, ebee ka mmadụ ahụ nọ nke nwere ike ịza ọ bụladị otu nʼime ajụjụ dị iche iche Chineke ga-ajụ ya?
4Amamihe ya dị ukwuu, ike ya sara mbara, onye guzogidere ya ma hapụ imerụ ahụ?