24Mgbe ala dabara nʼaka ndị na-emebi iwu, ọ na-ekpuchi ndị ọkaikpe anya. Ọ bụrụ na ọ bụghị ya na-eme ya, onye kwanụ bụ onye ahụ na-eme ya?
25“Ụbọchị ndụ m dị gara gara karịa onye ọgba ọsọ; ha na-agafekwa na-ahụtụghị ọṅụ anya.
26Ha na-agafe dịka ụgbọ mmiri papịrọs, dịka mgbe ugo na-efeda ngwangwa ijide anụ ọ ga-eri.
27Ọ bụrụ na m sị, ‘Aga m echefu mkpesa m, aga m agbanwe ihu m, nwee ihu ọchị.’
28Nsogbu m niile ka na-atụ m egwu nʼihi na amara m na ị gaghị ewere m dịka onye aka ya dị ọcha.