26Ha na-agafe dịka ụgbọ mmiri papịrọs, dịka mgbe ugo na-efeda ngwangwa ijide anụ ọ ga-eri.
27Ọ bụrụ na m sị, ‘Aga m echefu mkpesa m, aga m agbanwe ihu m, nwee ihu ọchị.’
28Nsogbu m niile ka na-atụ m egwu nʼihi na amara m na ị gaghị ewere m dịka onye aka ya dị ọcha.
29Ebe m bụrịị onye ikpe mara, nʼihi gịnị ka m ji na-adọgbu onwe m nʼefu?
30A sịkwarị na m jiri ncha saa ahụ m werekwa soda saa aka m abụọ,