28Nsogbu m niile ka na-atụ m egwu nʼihi na amara m na ị gaghị ewere m dịka onye aka ya dị ọcha.
29Ebe m bụrịị onye ikpe mara, nʼihi gịnị ka m ji na-adọgbu onwe m nʼefu?
30A sịkwarị na m jiri ncha saa ahụ m werekwa soda saa aka m abụọ,
31ị ga-enuba m nʼolulu apịtị nke pụrụ ime ka uwe m yi nʼahụ m kpọọ m asị.
32“Ọ bụghị mmadụ efu dịka m nke m ga-aza ya, ka anyị abụọ kpọrịtaa onwe anyị ikpe nʼụlọikpe.