30A sịkwarị na m jiri ncha saa ahụ m werekwa soda saa aka m abụọ,
31ị ga-enuba m nʼolulu apịtị nke pụrụ ime ka uwe m yi nʼahụ m kpọọ m asị.
32“Ọ bụghị mmadụ efu dịka m nke m ga-aza ya, ka anyị abụọ kpọrịtaa onwe anyị ikpe nʼụlọikpe.
33A sịkwarị na e nwere onye odozi okwu nʼetiti mụ na gị, onye ga-ebikwasị anyị abụọ aka ya,
34onye ga-ewepụ mkpara Chineke site nʼebe m nọ, ka oke egwu ya gharakwa ịtụ m ọzọ.