Job 9

Mgbe ala dabara nʼaka ndị na-emebi iwu, ọ na-ekpuchi ndị ọkaikpe anya. Ọ bụrụ na ọ bụghị ya na-eme ya, onye kwanụ bụ onye ahụ na-eme ya?

Job 9:24 (UKJV) The earth is given into the hand of the wicked: he covers the faces of the judges thereof; if not, where, and who is he?

22Otu ihe ahụ ka ọ bụ; nʼihi ya ka m ji asị, ‘Ọ na-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi.’

23Mgbe ịpịa ụtarị wetara ọnwụ mberede, ọ na-achị enweghị olileanya nke ndị na-enweghị ihe ha mere ọchị.

24Mgbe ala dabara nʼaka ndị na-emebi iwu, ọ na-ekpuchi ndị ọkaikpe anya. Ọ bụrụ na ọ bụghị ya na-eme ya, onye kwanụ bụ onye ahụ na-eme ya?

25“Ụbọchị ndụ m dị gara gara karịa onye ọgba ọsọ; ha na-agafekwa na-ahụtụghị ọṅụ anya.

26Ha na-agafe dịka ụgbọ mmiri papịrọs, dịka mgbe ugo na-efeda ngwangwa ijide anụ ọ ga-eri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.