6Ọ na-enugharịkwa ụwa site na ntọala ya, mee ka ogidi ya maa jijiji.
7Ọ na-agwa anyanwụ okwu mee ka ọ kwụsị ịcha; ọ na-emenyụ ìhè kpakpando na-enye.
8Naanị ya gbasara mbara eluigwe, ọ na-agakwa ije nʼelu ebili mmiri nke oke osimiri.
9Ọ bụ ya mere kpakpando Bịaa, na Orion na Pleiades, na kpakpando niile nke ndịda eluigwe.
10Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube nke mmadụ na-enweghị ike ịghọta, ihe ịrịbama nke ọnụ na-enweghị ike ịgụta.