Juel 1

Ọ bụ na e sitebeghị nʼihu anyị wezuga ihe oriri niile, Ọ bụ na ọṅụ na obi ụtọ e sitebeghị nʼụlọnsọ Chineke anyị pụọ?

Joel 1:16 (UKJV) Is not the food cut off before our eyes, yea, joy and gladness from the house of our God?

14Kpọsaanụ obubu ọnụ dị nsọ. Kpọọnụ nzukọta dị nsọ. Chịkọtaanụ ndị okenye na ndị niile bi nʼala a, ka ha bịa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị Chineke unu; ka ha tikuo Onyenwe anyị mkpu akwa.

15Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ bụ! Nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị abịala nso. Ọ ga-ewetakwa mbibi site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.

16Ọ bụ na e sitebeghị nʼihu anyị wezuga ihe oriri niile, Ọ bụ na ọṅụ na obi ụtọ e sitebeghị nʼụlọnsọ Chineke anyị pụọ?

17Mkpụrụ ubi akpọnwụọla nʼọkpụrụkpụ aja ala. Ụlọ a na-edebe ihe oriri atọgbọrọla nʼefu, a kwatuola ọba niile, nʼihi na mkpụrụ ọka niile akpọọla nku.

18Lee otu anụ ụlọ niile si eze ume! Igwe ehi na-awagharị nʼihi na ha enweghị ebe ịta nri; ọ bụladị igwe atụrụ nọkwa nʼọnọdụ ịta ahụhụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.