2Nụrụnụ nke a, unu ndị okenye; geenụ ntị, unu ndị niile bi nʼala a. Ihe dị otu a o meela na ndụ unu, ka o mere na ndụ nna nna unu ha?
3Gwanụ ya ụmụ unu, ka ụmụ unu gwakwa ụmụ ha, ka ụmụ ha gwakwa ụmụ ụmụ ha, ka ụmụ ụmụ ha gwakwa ọgbọ nke na-eso ha.
4Ihe igurube rifọrọ ka igurube ukwu richara, ihe igurube ukwu rifọrọ, ka ụmụ igurube richara, ihe ụmụ igurube rifọrọ ka igurube ndị ọzọ richapụrụ.
5Tetanụ, unu ndị na-aṅụbiga mmanya oke. Kwaanụ akwa. Kwaanụ akwa unu ndị na-aṅụ mmanya; kwaanụ akwa nʼihi mmanya ọhụrụ, nʼihi na e sitela nʼọnụ unu napụ unu mmanya unu na-aṅụ.
6O nwere mba bịakwasịrị ala m, usuu ndị agha nke na-enweghị ịgụta ọnụ; nke nwere eze dịka ọdụm, nweekwa ikiri eze dịka ka nne ọdụm.