1Fụọ opi ịdọ aka na ntị na Zayọn. Ka a nụ ụda opi ịdọ aka na ntị site nʼelu ugwu nsọ m. Ka ndị niile bi nʼala ahụ maa jijiji, nʼihi na ụbọchị ikpe nke Onyenwe anyị na-abịa, ọ na-abịaru nso.
2Ọ bụ ụbọchị ọchịchịrị na nke mgbarụ ihu. Ọ bụ ụbọchị itiri ojii nke oke ọchịchịrị. Usuu ndị agha dị ike nke ga-ekpuchi elu ugwu niile dịka chi ọbụbọ. Ha hiri nne, nweekwa ike dị ukwuu. Ahụbeghị ụdị dịka ha na mbụ, a gaghị ahụkwa ụdị ha ọzọ ruo ọgbọ niile nke na-abịa.
3Ọkụ na-ere na-aga ha nʼihu, ire ọkụ na-enwu oke onwunwu dị ha nʼazụ. Tupu ha abịaruo, ala ahụ na-ama mma dịka ogige nke Iden, ma nʼazụ ha, ala ubi niile dịka ọzara nke tọgbọrọ nʼefu, o nweghị ihe ga-agbanarị ịla nʼiyi ha.