8Ọ dịghị onye na-anọchiri ibe ya ụzọ. Onye ọbụla na-aga nʼihu nʼahịrị nʼahịrị. Ọ dịghị ngwa agha ọbụla pụrụ ịkwụsị ha, ka ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị.
9Ha na-enukwasị obodo, na-agbagharị nʼelu mgbidi, na-arịgo, na-abakwa nʼime ụlọ; na-abanye dịka ndị ohi site na oghereikuku niile.
10Ala na-ama jijiji nʼihu ha, eluigwe na-emekwa mkpọtụ. Ihu anyanwụ na ihu ọnwa na-agbakwa ọchịchịrị, kpakpando adịghịkwa enye ìhè.
11Olu Onyenwe anyị dara nʼihu ndị agha, ndị agha ya dị agụtaghị ọnụ, ha dịkwa ọtụtụ bụ ndị na-edebe iwu ya. Ụbọchị ikpe nke Onyenwe anyị dị ukwu bụrụkwa ihe dị egwu. Onye pụrụ ịnagide ya?
12“Ọ bụladị ugbu a,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “Jirinụ obi unu niile lọghachikwute m. Werekwanụ obubu ọnụ, na ịkwa akwa, na iru ụjụ, lọghachikwutenụ m.”