25“Aga m enyeghachi afọ niile nke igurube riri, ndị ahụ nke igurube ukwu na igurube nta, na ụkpana, na ndị mbibi ọzọ riri, bụ usuu ndị agha ahụ m zitere nʼetiti unu.
26Unu ga-eri ka unu siri chọọ, rijuchaa afọ, unu ga-etokwa Onyenwe anyị bụ Chineke unu, onye rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihi unu. Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ihere ga-eme ndị m.
27Mgbe ahụ unu ga-amata na m nọ nʼebe a nʼetiti ndị m Izrel. Unu ga-amatakwa na naanị m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, na ọ dịkwaghị onye ọzọ. Ihere agaghị emekwa ndị m ọzọ.
28“Ma emesịa, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma. Ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ. Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ.
29Nʼụbọchị ahụ, aga m awụsa mmụọ m ọbụladị nʼahụ ndị ohu m ndị nwoke na ndị nwanyị.