27Mgbe ahụ unu ga-amata na m nọ nʼebe a nʼetiti ndị m Izrel. Unu ga-amatakwa na naanị m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, na ọ dịkwaghị onye ọzọ. Ihere agaghị emekwa ndị m ọzọ.
28“Ma emesịa, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma. Ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ. Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ.
29Nʼụbọchị ahụ, aga m awụsa mmụọ m ọbụladị nʼahụ ndị ohu m ndị nwoke na ndị nwanyị.
30Aga m egosi ihe ebube dị iche iche na mbara eluigwe, na nʼelu ụwa; a ga-ahụ ọbara, na ire ọkụ, na ogidi anwụrụ ọkụ.
31Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa oke egwu.