Juel 2

Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa oke egwu.

Joel 2:31 (UKJV) The sun shall be turned into darkness, and the moon into blood, before the great and terrible day of the LORD come.

29Nʼụbọchị ahụ, aga m awụsa mmụọ m ọbụladị nʼahụ ndị ohu m ndị nwoke na ndị nwanyị.

30Aga m egosi ihe ebube dị iche iche na mbara eluigwe, na nʼelu ụwa; a ga-ahụ ọbara, na ire ọkụ, na ogidi anwụrụ ọkụ.

31Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa oke egwu.

32Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị ka a ga-azọpụta. Nʼihi na ọ bụ nʼelu ugwu Zayọn, na nʼime Jerusalem ka mgbapụta ga-adị, dịka Onyenwe anyị kwuru ya. Mgbapụta a ga-adịkwara ndị fọdụrụ ndụ, bụ ndị ahụ Onyenwe anyị na-akpọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.