5Nʼihi na unu weere ọlaọcha m na ọlaedo m, burukwa ihe dị oke ọnụahịa niile m nwere, bulaa ha nʼụlọnsọ chi unu.
6Unu refuru ndị Juda na ndị Jerusalem, resi ha ndị Griik, si otu a wega ha nʼebe dị anya site nʼala ha.
7“Lee, aga m esi nʼebe ahụ unu refuru ha kpọlite ha. Aga m emekwa ka ihe ndị ahụ niile unu mere bịaghachi unu nʼisi.
8Aga m ewere ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị resi ha ndị Juda, ndị ga-eresi ha ndị Sheba, bụ mba tere anya.” Onyenwe anyị ekwuola ya.
9Kwupụtanụ nke a nʼetiti mba niile: Jikerenụ agha! Kpọteenụ ndị dike nʼagha. Ka ndị agha niile a zụziri azụzi bịaruo nso ibu agha.