Juel 3

Kwupụtanụ nke a nʼetiti mba niile: Jikerenụ agha! Kpọteenụ ndị dike nʼagha. Ka ndị agha niile a zụziri azụzi bịaruo nso ibu agha.

Joel 3:9 (UKJV) Proclaim all of you this among the Gentiles; Prepare war, wake up the mighty men, let all the men of war draw near; let them come up:

7“Lee, aga m esi nʼebe ahụ unu refuru ha kpọlite ha. Aga m emekwa ka ihe ndị ahụ niile unu mere bịaghachi unu nʼisi.

8Aga m ewere ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị resi ha ndị Juda, ndị ga-eresi ha ndị Sheba, bụ mba tere anya.” Onyenwe anyị ekwuola ya.

9Kwupụtanụ nke a nʼetiti mba niile: Jikerenụ agha! Kpọteenụ ndị dike nʼagha. Ka ndị agha niile a zụziri azụzi bịaruo nso ibu agha.

10Kpụgharịanụ mma oge unu ka ha bụrụkwa mma agha, kpụgharịakwanụ mma ịkwa osisi unu ka ha ghọọ ùbe. Ka onye na-adịghị ike kwuo sị, “Adị m ike!”

11Chịkọta onwe unu ọsịịsọ, bịa, unu mba niile, nọ nʼebe niile. Zukọtaanụ nʼebe ahụ. Kpọdata ndị agha gị dị ike Onyenwe anyị!

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.