Jọn 1

Nʼihi na e nyere iwu site nʼaka Mosis, ma amara na eziokwu bịara site nʼaka Jisọs Kraịst.

John 1:17 (UKJV) For the law was given by Moses, but grace and truth came by Jesus Christ.

15Jọn gbara ama banyere ya mgbe ọ na-eti mkpu na-asị, “Onye a bụ onye ahụ m kwuru banyere ya, ‘Onye na-abịa m nʼazụ dị ukwuu karịa m, nʼihi na o bukwa m ụzọ dịrị.’ ”

16Site nʼịba ụba nke amara ya, anyị niile anatala amara a tụkwasịrị nʼamara.

17Nʼihi na e nyere iwu site nʼaka Mosis, ma amara na eziokwu bịara site nʼaka Jisọs Kraịst.

18Ọ dịbeghị onye ọbụla hụrụla Chineke, ma Chineke, onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ. Onye ya na Nna dị na mma, emeela ka anyị mata ya.

19Nke a bụ ịgba ama Jọn mgbe ndị ndu ndị Juu nọ na Jerusalem zipụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị ka ha bịa jụọ ya onye ọ bụ?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.