17Nʼihi na e nyere iwu site nʼaka Mosis, ma amara na eziokwu bịara site nʼaka Jisọs Kraịst.
18Ọ dịbeghị onye ọbụla hụrụla Chineke, ma Chineke, onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ. Onye ya na Nna dị na mma, emeela ka anyị mata ya.
19Nke a bụ ịgba ama Jọn mgbe ndị ndu ndị Juu nọ na Jerusalem zipụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị ka ha bịa jụọ ya onye ọ bụ?
20O mechighị ọnụ ya, kama o kwupụtara sị, “Abụghị m Kraịst ahụ.”
21Mgbe ahụ ha jụrụ ya sị, “Ị bụkwanụ onye? Ị bụ Ịlaịja?” Ọ zara sị ha, “Abụghị m ya.” “Ị bụ Onye amụma ahụ?” “Mba.”