28Ana m enye ha ndụ ebighị ebi. Ha agaghị ala nʼiyi. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike ịpụnarị ha nʼaka m.
29Nna m onye nyere m ha dị ukwuu karịa ihe niile. O nweghị onye nwere ike ịnapụ ha site nʼaka Nna m.
30Mụ na nna m bụ otu.”
31Ndị Juu tụtụlitekwara nkume ọzọ ịtụ ya.
32Ma Jisọs zara ha, “E zila m unu ọtụtụ ọrụ ọma nke sitere nʼaka Nna m, olee nke unu na-achọ ịtụ m nkume nʼihi ya?”