30Mụ na nna m bụ otu.”
31Ndị Juu tụtụlitekwara nkume ọzọ ịtụ ya.
32Ma Jisọs zara ha, “E zila m unu ọtụtụ ọrụ ọma nke sitere nʼaka Nna m, olee nke unu na-achọ ịtụ m nkume nʼihi ya?”
33Ndị Juu zara ya, “Anyị achọghị ịtụ gị nkume nʼihi ọrụ ọma ndị a, kama nʼihi nkwulu na nʼihi na gị bụ mmadụ efu, ma ị na-eme onwe gị Chineke.”
34Jisọs zara ha, “Edeghị ya nʼiwu unu, sị, ‘Mụ onwe m sịrị na unu bụ chi’?