14Mgbe ahụ, Jisọs gwaghere ha ọnụ, “Lazarọs anwụọla.
15Ma nʼihi unu, obi dị m ụtọ na anọghị m nʼebe ahụ, ka unu nwe ike kwere. Ma bịanụ ka anyị gakwuru ya.”
16Tọmọs, onye a na-akpọ Didimọs, gwara ndị na-eso ụzọ ibe ya, “Ka anyị gakwanụ ka anyị soro ya nwụọ.”
17Mgbe Jisọs rutere, ọ chọpụtara na Lazarọs anọọlarị nʼili ụbọchị anọ.
18Betani dị Jerusalem nso, ihe dị ka kilomita atọ.