29Mgbe ọ nụrụ nke a, ọ biliri ọsịịsọ ga zute ya.
30Ruo mgbe a, Jisọs abịarutebeghị nʼobodo nta ahụ, ma ọ ka nọ nʼebe ahụ Mata zutere ya.
31Ndị Juu nọ nʼụlọ na-akasị Meri obi hụrụ ya ka ọ pụrụ ngwangwa. Ha sochiri ya nʼazụ nʼihi na ha chere na ọ na-aga nʼili ibe akwa nʼebe ahụ.
32Mgbe Meri rutere nʼebe Jisọs nọ, ọ dara nʼụkwụ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị nọ nʼebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.”
33Mgbe Jisọs hụrụ ya ka ọ na-ebe akwa ya na ndị Juu ahụ so ya ka ha na-ebekwa akwa, o metụrụ ya nʼime mmụọ ya. O nwere ọmịiko dị ukwuu.