31Ndị Juu nọ nʼụlọ na-akasị Meri obi hụrụ ya ka ọ pụrụ ngwangwa. Ha sochiri ya nʼazụ nʼihi na ha chere na ọ na-aga nʼili ibe akwa nʼebe ahụ.
32Mgbe Meri rutere nʼebe Jisọs nọ, ọ dara nʼụkwụ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị nọ nʼebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.”
33Mgbe Jisọs hụrụ ya ka ọ na-ebe akwa ya na ndị Juu ahụ so ya ka ha na-ebekwa akwa, o metụrụ ya nʼime mmụọ ya. O nwere ọmịiko dị ukwuu.
34Ọ sịrị, “Olee ebe unu liri ya?” Ha sịrị ya, “Onyenwe anyị bịa ka ị hụ.”
35Jisọs ebee akwa.