37Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Nwoke a meghere anya onye kpuru ìsì, ọ garaghị enwe ike mee ka nwoke a hapụ ịnwụ?”
38Ọzọkwa, Jisọs sụrụ ude nʼime onwe ya nke ukwuu, bịarute nʼili ahụ nso. Ili ahụ bụ ọgba e jiri nkume dị ukwuu mechie ọnụ ya.
39Jisọs sịrị, “Bupunụ nkume ahụ!” Ma Mata, nwanne nwanyị onye ahụ nwụrụ anwụ, sịrị ya, “Onyenwe anyị, ọ ga na-esi isi ugbu a, nʼihi na nke a bụ abalị anọ ọ nwụrụ.”
40Ma Jisọs sịrị ya, “Ọ bụ na m agwaghị gị sị na ọ bụrụ na ị kwere ị ga-ahụ ọrụ ebube Chineke?”
41Ya mere, ha bupụrụ nkume ahụ. Jisọs lere anya nʼelu sị, “Nna, ana m ekele gị nʼihi na ị nụla olu m.