39Jisọs sịrị, “Bupunụ nkume ahụ!” Ma Mata, nwanne nwanyị onye ahụ nwụrụ anwụ, sịrị ya, “Onyenwe anyị, ọ ga na-esi isi ugbu a, nʼihi na nke a bụ abalị anọ ọ nwụrụ.”
40Ma Jisọs sịrị ya, “Ọ bụ na m agwaghị gị sị na ọ bụrụ na ị kwere ị ga-ahụ ọrụ ebube Chineke?”
41Ya mere, ha bupụrụ nkume ahụ. Jisọs lere anya nʼelu sị, “Nna, ana m ekele gị nʼihi na ị nụla olu m.
42Amaara m na ị na-anụ olu m mgbe niile. Ana m ekwu nke a nʼihi ndị a gbara m gburugburu nʼebe a, ka ha kwere na ọ bụ gị zitere m.”
43Mgbe o kwusiri nke a, o jiri oke olu tie mkpu, “Lazarọs, pụta!”