55Mmemme Ngabiga ndị Juu dịkwa nso. Ọtụtụ ndị mmadụ si nʼakụkụ ala ndị Juu niile bịa Jerusalem. Ha bịara tutu mmemme ahụ ebido ka ha mee onwe ha ka ha dị ọcha.
56Ha na-achọ Jisọs na-ajụrịta onwe ha nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ, “Gịnị ka unu chere? Ọ bụ na ọ gaghị abịa na mmemme a?”
57Ma nʼoge ahụ, ndịisi nchụaja na ndị Farisii enyela iwu ka onye ọbụla hụrụ ya bịa gwa ha ka ha gaa jide ya.