Jọn 12

Ụbọchị isii tupu e mee Mmemme Ngabiga, Jisọs gara Betani bụ obodo Lazarọs, onye ahụ ọ mere ka o site nʼọnwụ bilie.

John 12:1 (UKJV) Then Jesus six days before the passover came to Bethany, where Lazarus was, which had been dead, whom he raised from the dead.

1Ụbọchị isii tupu e mee Mmemme Ngabiga, Jisọs gara Betani bụ obodo Lazarọs, onye ahụ ọ mere ka o site nʼọnwụ bilie.

2Nʼebe ahụ, ha siiri Jisọs nri, ọ bụkwa Mata na-eje ozi isi nri ahụ, Lazarọs bụ otu onye nʼime ndị sooro ya nọdụ na nri ahụ.

3Mgbe ahụ, Meri weere mmanụ otite dị ọkara lita nke ezigbo naad, mmanụ isi ụtọ dị oke ọnụahịa, ọ wụkwasara ya Jisọs nʼụkwụ, jirikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya. Nke a mere ka ụlọ ahụ jupụta nʼisi ụtọ nke mmanụ otite ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.