7Ya mere, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Ngwanụ ka anyị laghachi azụ na Judịa.”
8Ma ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onye ozizi, nʼoge nta gara aga ka ndị Juu chọrọ ịtụ gị nkume. Ị na-agakwa ebe ahụ ọzọ?”
9Jisọs zara, “Ọ bụghị awa iri na abụọ dị nʼotu ehihie nke ụbọchị? Onye na-ejegharị nʼehihie anaghị asụ ngọngọ, nʼihi na ọ na-eji ìhè nke ụwa a ahụ ụzọ.
10Ma ndị na-ejegharị nʼabalị na-azọhie ụkwụ, nʼihi na ìhè adịghị nʼime ha.”
11Mgbe o kwusiri nke a, ọ gwakwara ha, “Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra, ma ana m aga ịkpọte ya nʼụra.”