11Nʼihi na ọ bụ nʼihi ya ka ọtụtụ ndị Juu ji na-ahapụ ha ma na-ekwerekwa na Jisọs.
12Nʼechi ya oke igwe mmadụ ahụ ndị bịara mmemme nụrụ na Jisọs na-abịa Jerusalem.
13Ha weere igu nkwụ pụọ izute ya na-eti mkpu, “Hozanna!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!” “Ngọzị dịrị eze Izrel!”
14Jisọs hụrụ nwa ịnyịnya ibu, nọkwasị nʼelu ya, dị ka e dere ya,
15“Atụla egwu, gị ada Zayọn! Lee, eze gị ka ọ na-abịa. Ọ nọkwasịrị nʼelu nwa ịnyịnya ibu.”