9Ma mgbe igwe ndị Juu nụrụ na ọ nọ nʼebe ahụ, ha bịara, ọ bụghị naanị ka ha hụ ya, kama ka ha hụkwa Lazarọs onye o mere ka o si na ndị nwuru anwụ bilie.
10Ya mere, ndịisi nchụaja gbakwara izu igbukwa Lazarọs.
11Nʼihi na ọ bụ nʼihi ya ka ọtụtụ ndị Juu ji na-ahapụ ha ma na-ekwerekwa na Jisọs.
12Nʼechi ya oke igwe mmadụ ahụ ndị bịara mmemme nụrụ na Jisọs na-abịa Jerusalem.
13Ha weere igu nkwụ pụọ izute ya na-eti mkpu, “Hozanna!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!” “Ngọzị dịrị eze Izrel!”