26Onye ọbụla na-ejere m ozi aghaghị iso m; ebe m nọ ka onye na-ejere m ozi ga-anọkwa. Onye ọbụla na-ejere m ozi ka Nna m ga-asọpụrụ.
27“Ugbu a, mkpụrụobi m jupụtara nʼihe mgbu. Gịnịkwa ka m ga-ekwu, Nna, zọpụta m nʼawa nke a? Mba! Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji bịa nʼoge awa a.
28Nna, nye aha gị otuto.” Mgbe ahụ, otu olu siri nʼeluigwe bịa, “Enyela m ya otuto, m ga-enyekwa ya otuto ọzọ.”
29Igwe ndị mmadụ guzo nʼebe ahụ, ndị nụrụ ya na-ekwu, “Ọ bụ egbe eluigwe gbara.” Ndị ọzọ na-asị, “Ọ bụ mmụọ ozi na-agwa ya okwu.”
30Jisọs zara ma sị, “Olu a abịaghị nʼihi m kama ọ bịara nʼihi unu.