Jọn 17

I nyela ya ikike nʼebe mmadụ niile nọ, na ike inye ndị niile i nyere ya ndụ ebighị ebi.

John 17:2 (UKJV) As you have given him power over all flesh, that he should give eternal life to as many as you have given him.

1Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, o leliri anya nʼeluigwe sị, “Nna, oge ahụ a kara aka eruola, nye Ọkpara gị otuto, ka Ọkpara gị nyekwa gị otuto.

2I nyela ya ikike nʼebe mmadụ niile nọ, na ike inye ndị niile i nyere ya ndụ ebighị ebi.

3Nke a bụkwa ndụ ebighị ebi ahụ. Ka ha mata na naanị gị bụ Chineke nʼezie, matakwa Jisọs Kraịst onye ahụ i zitere nʼụwa.

4Enyere m gị otuto nʼụwa site nʼịrụzu ọrụ niile ị nyere m ka m rụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.