Jọn 19

Nʼebe ahụ ka ha kpọgidere ya nʼobe, ya na mmadụ abụọ ndị ọzọ. Otu onye nʼaka nri ya, onye nke ọzọ nʼaka ekpe ya.

John 19:18 (UKJV) Where they crucified him, and two other with him, on either side one, and Jesus in the midst.

16Mgbe ahụ, o nyefere ya nʼaka ha, ka ha kpọgide ya nʼobe. Ha kpọọrọ Jisọs pụọ.

17O buuru obe ya gaa nʼebe a na-akpọ Okpokoro Isi (nke pụtara Gọlgọta nʼasụsụ Hibru).

18Nʼebe ahụ ka ha kpọgidere ya nʼobe, ya na mmadụ abụọ ndị ọzọ. Otu onye nʼaka nri ya, onye nke ọzọ nʼaka ekpe ya.

19O nwere ihe Pailet dere kụpanye nʼelu obe ahụ. Ihe o dere bụ nke a: Jisọs onye Nazaret, Eze ndị Juu.

20Ọtụtụ ndị Juu gụrụ ihe a o dere, nʼihi na ebe a kpọgburu Jisọs dị nso nʼobodo ahụ. E dekwara ya nʼasụsụ Hibru, Griik na Latin.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.