39Nikọdimọs, onye ahụ bịakwutere Jisọs nʼabalị na mbụ, bịakwara. O wetara máá na aloos a gwakọtara agwakọta, nke ọtụtụ ya ruru ihe dịka kilogram iri atọ na anọ.
40Ha buuru ahụ Jisọs, tee ya ụda ndị ahụ, fụchikwaa ya nʼakwa ọcha linin dịka omenaala olili ozu nke ndị Juu si dị.
41Ebe ahụ a kpọgidere ya nʼobe dị nʼotu ubi a gbara ogige. Nʼime ogige a, otu ili ọhụrụ dị na ya nke e jibeghị lie onye ọbụla.
42Nʼihi na ọ bụ ụbọchị Nkwadebe nke ndị Juu, nakwa nʼihi na ili ahụ dị nso, ha dọnyere ahụ Jisọs nʼime ya.