5Ya mere, ọ batara nʼotu obodo nta dị na Sameria a na-akpọ Saika, nʼakụkụ ala ahụ Jekọb nyere Josef nwa ya nwoke.
6Olulu mmiri Jekọb dị nʼebe ahụ, ma ebe ọ bụ na ike gwụrụ Jisọs nʼije ya, ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ olulu mmiri ahụ. Ọ bụ ihe dị ka oge ehihie.
7Otu nwanyị onye Sameria bịara ịdọrọ mmiri, Jisọs sịrị ya, “Nyetụ m mmiri ka m ṅụọ.”
8(Ndị na-eso ụzọ ya abaala nʼime obodo ịga zụta nri.)
9Nwanyị ahụ sịrị ya, “Olee otu gị bụ onye Juu si arịọ m bụ nwanyị Sameria mmiri ka ị ṅụọ?” (Nʼihi na ndị Juu na ndị Sameria anaghị emekọrịta ihe ọbụla.)