39Unu na-enyocha akwụkwọ nsọ nʼihi na unu chere na unu ga-esite na ha nwee ndụ ebighị ebi maọbụ ha na-agba ama banyere m.
40Ma unu jụrụ ịbịakwute m ka unu nwee ndụ.
41“Anaghị m anabata otuto nke ụmụ mmadụ.
42Ma amatara m na unu enweghị ịhụnanya Chineke nʼobi unu.
43Abịala m nʼaha Nna m ma unu anabataghị m. Ma ọ bụrụ na onye ọzọ abịa nʼaha nke onwe ya, unu ga-anabata ya.