40Ma unu jụrụ ịbịakwute m ka unu nwee ndụ.
41“Anaghị m anabata otuto nke ụmụ mmadụ.
42Ma amatara m na unu enweghị ịhụnanya Chineke nʼobi unu.
43Abịala m nʼaha Nna m ma unu anabataghị m. Ma ọ bụrụ na onye ọzọ abịa nʼaha nke onwe ya, unu ga-anabata ya.
44Olee otu unu ga-esi kwere ebe unu na-anara otuto site nʼaka ibe unu, ma unu adịghị achọ otuto nke si nʼaka onye naanị ya bụ Chineke?