42Ma amatara m na unu enweghị ịhụnanya Chineke nʼobi unu.
43Abịala m nʼaha Nna m ma unu anabataghị m. Ma ọ bụrụ na onye ọzọ abịa nʼaha nke onwe ya, unu ga-anabata ya.
44Olee otu unu ga-esi kwere ebe unu na-anara otuto site nʼaka ibe unu, ma unu adịghị achọ otuto nke si nʼaka onye naanị ya bụ Chineke?
45“Unu echela na m ga-ebo unu ebubo nʼihu Nna ahụ. Onye ga-ebo unu ebubo bụ Mosis, bụ onye unu tụkwasịrị obi na ya.
46Ọ bụrụ na unu kwenyeere Mosis, unu gakwara ekwere na m, nʼihi na o dere banyere m.