41Nʼihi nke a, ndị Juu bidoro itamu ntamu megide ya nʼihi na ọ sịrị, “Abụ m achịcha ahụ siri nʼeluigwe rịdata.”
42Ha sịrị, “Onye a ọ bụghị Jisọs, nwa Josef, bụ onye anyị matara nne na nna ya? Oleekwanụ otu o si ekwu ugbu a sị, ‘Esi m nʼeluigwe rịdata’?”
43Jisọs zara sị ha, “Unu atamula nʼetiti onwe unu.
44O nweghị onye nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụghị na Nna ahụ zitere m kpọtara ya, aga m akpọlitekwa ya nʼụbọchị ikpeazụ.
45E dere ya nʼakwụkwọ ndị amụma, ‘Ha niile ga-abụ ndị Chineke ga-akụziri ihe.’ Onye ọbụla nke gere Nna ahụ ntị ma mụtakwa ihe site na ya na-abịakwute m.