56Onye ọbụla na-eri anụ ahụ m na-aṅụkwa ọbara m na-anọgide nʼime m mụ onwe m kwa nʼime ya.
57Dị ka Nna ahụ dị ndụ zitere m, ana m adịkwa ndụ nʼihi Nna ahụ, otu a ka onye na-eri m ga-adịkwa ndụ site na m.
58Nke a bụ achịcha ahụ si nʼeluigwe bịa. Nna nna unu ha riri mánà ma nwụkwaa, ma onye ọbụla na-eri achịcha a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”
59O kwuru ihe ndị a mgbe ọ na-akụzi ihe nʼụlọ ekpere dị na Kapanọm.
60Mgbe ọtụtụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya ha nụrụ nke a, ha sịrị, “Nke a bụ ozizi siri ike, onye nwere ike ịnabata ya?”