58Nke a bụ achịcha ahụ si nʼeluigwe bịa. Nna nna unu ha riri mánà ma nwụkwaa, ma onye ọbụla na-eri achịcha a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”
59O kwuru ihe ndị a mgbe ọ na-akụzi ihe nʼụlọ ekpere dị na Kapanọm.
60Mgbe ọtụtụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya ha nụrụ nke a, ha sịrị, “Nke a bụ ozizi siri ike, onye nwere ike ịnabata ya?”
61Ebe Jisọs matara na ndị na-eso ụzọ ya na-atamu ntamu maka nke a ọ sịrị ha, “Nke a ọ na-ewute unu?
62Gịnị ka unu ga-ekwu ma ọ bụrụ na unu ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-arịgo ebe ọ nọrịị na mbụ.