47Ndị Farisii zara ha, “Unu esorola bụrụ ndị a ghọgburu?
48Ọ dị onye ọbụla nʼime ndịisi maọbụ nʼime ndị Farisii tụkwasịrị ya obi?
49E e! Kama igwe mmadụ ndị a na-amaghị iwu bụ ndị a bụrụ ọnụ.”
50Nikọdimọs, otu nʼime ha bụ onye bịakwutere ya na mbụ sịrị ha,
51“Iwu anyị ọ na-ama mmadụ ikpe, ma ọ bụrụ na o bụghị ụzọ nụta okwu nʼọnụ ya, ịchọpụta ihe onye ahụ na-eme?”