15Unu na-ekpe ikpe dị ka mmadụ; ma ekpeghị m onye ọbụla ikpe.
16Ma ọ bụrụ na m ekpe ikpe, ikpe m bụ eziokwu nʼihi na ọ bụghị naanị m nọ, kama ọ bụ mụ na Nna m, onye zitere m.
17E dere nʼiwu unu sị, ‘ama mmadụ abụọ gbara bụ eziokwu.’
18Ana m agba ama banyere onwe m. Nna m, onye zitere m, na-agbakwa ama banyere m.”
19Mgbe ahụ ha jụrụ ya, “Olee ebe Nna gị nọ?” Jisọs zara, “Unu amaghị m, unu amakwaghị Nna m. Ọ bụrụ na unu matara m unu ga-amatakwa onye Nna m bụ.”