Jọn 8

Ana m agba ama banyere onwe m. Nna m, onye zitere m, na-agbakwa ama banyere m.”

John 8:18 (UKJV) I am one that bear witness of myself, and the Father that sent me bears witness of me.

16Ma ọ bụrụ na m ekpe ikpe, ikpe m bụ eziokwu nʼihi na ọ bụghị naanị m nọ, kama ọ bụ mụ na Nna m, onye zitere m.

17E dere nʼiwu unu sị, ‘ama mmadụ abụọ gbara bụ eziokwu.’

18Ana m agba ama banyere onwe m. Nna m, onye zitere m, na-agbakwa ama banyere m.”

19Mgbe ahụ ha jụrụ ya, “Olee ebe Nna gị nọ?” Jisọs zara, “Unu amaghị m, unu amakwaghị Nna m. Ọ bụrụ na unu matara m unu ga-amatakwa onye Nna m bụ.”

20Okwu ndị a niile ka o kwuru nʼụlọnsọ ukwu ha, mgbe ọ na-akụzi ihe na mpaghara ụlọ ahụ ebe a na-adọba onyinye. Ma ọ dịghị onye ọbụla jidere ya nʼihi na oge ya erubeghị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.