Jọn 8

Unu na-ekpe ikpe dị ka mmadụ; ma ekpeghị m onye ọbụla ikpe.

John 8:15 (UKJV) All of you judge after the flesh; I judge no man.

13Ndị Farisii sịrị, “Ị na-agbara onwe gị ama! Ya mere ama ị na-agbara onwe gị abụghị ezie.”

14Ma Jisọs zara sị, “A sịkwarị na mụ na-agbara onwe m ama, ama m na-agba bụ eziokwu. Nʼihi na-amara m ebe m si bịa, marakwa m ebe m na-aga. Ma unu aghọtaghị ebe m si bịa, maọbụ ebe m na-aga.

15Unu na-ekpe ikpe dị ka mmadụ; ma ekpeghị m onye ọbụla ikpe.

16Ma ọ bụrụ na m ekpe ikpe, ikpe m bụ eziokwu nʼihi na ọ bụghị naanị m nọ, kama ọ bụ mụ na Nna m, onye zitere m.

17E dere nʼiwu unu sị, ‘ama mmadụ abụọ gbara bụ eziokwu.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.