28Ya mere Jisọs sịrị, “Mgbe unu weliri Nwa nke Mmadụ elu, mgbe ahụ ka unu ga-ama na mụ onwe m bụ ya. Unu ga-amatakwa na ọ dịghị ihe m na-eme nʼonwe m, kama, dị ka Nna m ziri m ka m na-ekwu ihe ndị a.
29Onye ahụ nke zitere m na-anọnyekwara m. Ọ hapụghịkwa m mgbe ọbụla, nʼihi na ọ bụ ihe na-amasị ya ka m na-eme mgbe niile.”
30Mgbe ọ na-ekwu ihe ndị a, ọtụtụ kwenyere na ya.
31Jisọs gwara ndị Juu ndị kwere na ya, “Ọ bụrụ na unu anọgide nʼokwu m nʼezie unu ga-abụ ndị na-eso ụzọ m.
32Unu ga-amatakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”