30Mgbe ọ na-ekwu ihe ndị a, ọtụtụ kwenyere na ya.
31Jisọs gwara ndị Juu ndị kwere na ya, “Ọ bụrụ na unu anọgide nʼokwu m nʼezie unu ga-abụ ndị na-eso ụzọ m.
32Unu ga-amatakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”
33Ha zara ya, “Anyị bụ ụmụ Ebraham, o nwebeghị oge anyị ji bụrụ ohu onye ọbụla. Olee otu i si na-asị na a ga-eme ka anyị nwere onwe anyị?”
34Jisọs zara ha, “Nʼezie, nʼezie asị m unu, onye ọbụla na-eme mmehie bụ ohu mmehie.