45Ma nʼihi na m na-ekwu eziokwu, ọ bụ ya mere unu ekwenyeghị na m.
46O nwere onye nʼime unu pụrụ ịtụ m mmehie m nʼihu? Ọ bụrụ na m na-ekwu eziokwu, gịnị mere unu ekwenyeghị na m?
47Onye ọbụla sitere na Chineke na-anụ ihe Chineke na-ekwu. Ihe kpatara unu adịghị anụ bụ maka unu abụghị ndị nke Chineke.”
48Ndị Juu zara sị, “Anyị e kwughị eziokwu mgbe anyị sịrị na ị bụ onye Sameria, na mmụọ ọjọọ bikwa nʼime gị?”
49Jisọs zaghachiri, “Mmụọ ọjọọ ọbụla adịghị nʼime m, kama ana m asọpụrụ Nna m, ma unu adịghị asọpụrụ m.