47Onye ọbụla sitere na Chineke na-anụ ihe Chineke na-ekwu. Ihe kpatara unu adịghị anụ bụ maka unu abụghị ndị nke Chineke.”
48Ndị Juu zara sị, “Anyị e kwughị eziokwu mgbe anyị sịrị na ị bụ onye Sameria, na mmụọ ọjọọ bikwa nʼime gị?”
49Jisọs zaghachiri, “Mmụọ ọjọọ ọbụla adịghị nʼime m, kama ana m asọpụrụ Nna m, ma unu adịghị asọpụrụ m.
50Anaghị m achọ otuto nke onwe m, kama ọ dị onye nke na-achọ ya. Ọ bụkwa ya bụ onye ikpe.
51Nʼezie, nʼezie, agwa unu, onye ọbụla na-edebe okwu m agaghị anwụ ọzọ.”